11Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
12“Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
13“Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu.
14“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.
15“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.