30Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile.
31“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.
32Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla.
33Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.”