Ọpụpụ 23

“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.

Exodus 23:8 (UKJV) And you shall take no gift: for the gift blinds the wise, and perverts the words of the righteous.

6“Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha.

7Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya.

8“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.

9“Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.

10“Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.