11Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
12Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya
13Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a.
14Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
15Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile.