Ọpụpụ 25

Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile.

Exodus 25:30 (UKJV) And you shall set upon the table showbread before me always.

28Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.

29Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye.

30Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile.

31“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.

32Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.