33Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
34Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
35Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
36Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
37“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya.