10Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
11Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
12Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ.
13Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya.
14Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya.