21Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
22Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii.
23Rụọ mbudo ibo abụọ, ga-adị na nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ.
24Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ.
25Ha niile ga-adị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.