33Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.
34Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ.
35Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda.
36“Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
37Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha.