7“Ị ga-eji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
8Akwa mgbochi iri na otu ndị a ga-aha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo. Ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
9Dụkọtaa ise nʼime akwa mgbochi ahụ. Debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. Pịajie akwa mgbochi nke isii ụzọ abụọ nʼihu ụlọ nzute ahụ.
10Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
11Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.