8Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.
9“Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
10Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
11Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
12“Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri.