22“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
23Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo abụọ, dụnye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
24Dụnye ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ,
25were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa, konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
26Ị ga-emekwa mgbaaka ọlaedo, konye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.