Ọpụpụ 29

tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.

Exodus 29:24 (UKJV) And you shall put all in the hands of Aaron, and in the hands of his sons; and shall wave them for a wave offering before the LORD.

22“Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ),

23site na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke na-adị nʼihu Onyenwe anyị. Were otu achịcha dị gburugburu, otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha,

24tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.

25Mgbe ahụ, nara ha site nʼaka ha. Kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ ihe isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

26Mgbe i wepụtara obi ebule ahụ e ji doo Erọn nsọ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ọ ga-abụkwa oke nke gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.