Ọpụpụ 3

Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?”

Exodus 3:11 (UKJV) And Moses said unto God, Who am I, that I should go unto Pharaoh, and that I should bring forth the children of Israel out of Egypt?

9Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha.

10Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.”

11Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?”

12Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”

13Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.