1Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke.
2Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ.
3Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.”
4Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.”