33A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ”
34Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe.
35Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ.
36Gwerie ụfọdụ nʼime ya ka ọ dịka uzuzu. Wụsa ya nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ nʼime ụlọ nzute, ebe m ga-ezute gị. Ọ ga-abụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye unu.
37Unu emerela onwe unu nke dịka ọtụtụ ụdị ihe nsure ọkụ a. Hụta ya ka ihe dị nsọ nʼebe Onyenwe anyị nọ.