1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
2“Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda,
3emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche,
4ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
5ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.