Ọpụpụ 31

“ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,

Exodus 31:7 (UKJV) The tabernacle of the congregation, and the ark of the testimony, and the mercy seat that is thereupon, and all the furniture of the tabernacle,

5ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.

6Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel. “Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:

7“ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,

8na tebul, na ngwongwo ya, ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha, na ngwongwo ya,

9na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.