Ọpụpụ 32

Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.”

Exodus 32:17 (UKJV) And when Joshua heard the noise of the people as they shouted, he said unto Moses, There is a noise of war in the camp.

15Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ.

16Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akaọrụ Chineke, ihe e dere nʼelu ha bụ ihe Chineke nʼonwe ya dekwasịrị nʼelu mbadamba nkume ndị ahụ.

17Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.”

18Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.”

19Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.