Ọpụpụ 32

Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.”

Exodus 32:2 (UKJV) And Aaron said unto them, Break off the golden earrings, which are in the ears of your wives, of your sons, and of your daughters, and bring them unto me.

1Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ na Mosis anọọla ọdụ ịrịdata site nʼelu ugwu Saịnaị, ha zukọtara, bịakwute Erọn, sị ya, “Bilie, meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.”

2Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.”

3Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn.

4Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.