Ọpụpụ 32

Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.”

Exodus 32:30 (UKJV) And it came to pass on the next day, that Moses said unto the people, All of you have sinned a great sin: and now I will go up unto the LORD; possibly I shall make an atonement for your sin.

28Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ.

29Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.”

30Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.”

31Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo.

32Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.