1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala Ijipt kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere Ebraham, na Aịzik na Jekọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’
2Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.
3Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.”