Ọpụpụ 35

“Unu niile ndị nwere onyinye ịkwa ǹka, bịanụ rụọ ihe ahụ niile Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu ịrụ, nke bụ ihe ndị a:

Exodus 35:10 (UKJV) And every wise hearted among you shall come, and make all that the LORD has commanded;

8mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;

9nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.

10“Unu niile ndị nwere onyinye ịkwa ǹka, bịanụ rụọ ihe ahụ niile Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu ịrụ, nke bụ ihe ndị a:

11“ụlọ nzute ahụ, na ihe mkpuchi ya, na nko ya niile, na mbudo ibo ya, na mkpọrọ osisi ya, na ogidi ya, na ụkwụ ya niile.

12Rụkwanụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na mkpara ahụ e ji ebu ya. Ya na oche ebere ahụ. Mekwaanụ akwa mgbochi nke ga-ekpuchi ebe nsọ ahụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.