Ọpụpụ 35

Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ.

Exodus 35:20 (UKJV) And all the congregation of the children of Israel departed from the presence of Moses.

18ǹtu maka ịkpọgide ụlọ ikwu ahụ na nke ogige ahụ, na ụdọ ha,

19uwe niile a kpara akpa nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.”

20Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ.

21Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ.

22Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.