16Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.
17Mgbe ahụ, ha dụnyekwara iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Mekwaa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
18Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
19Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya.
20Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.