3Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.
4Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ,
5bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
6Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ.
7Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ.