14Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ bụ ihe dị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
15Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa bụ ihe dị nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ
16Akwa mgbochi niile nke ogige ahụ gburugburu bụ ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
17Ogidi ọbụla nwere ihe ndọkwasị bronz. Nko niile na ihe njikọta niile ka e jikwa ọlaọcha machie. Ọ bụkwa naanị ọlaọcha ka e ji mee okporo osisi ndị ahụ.
18Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu.