Ọpụpụ 4

Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.)

Exodus 4:26 (UKJV) So he let him go: then she said, A bloody husband you are, because of the circumcision.

24Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Mosis chọọ igbu ya.

25Ma Zipọra nwunye Mosis weere mma ntakịrị bie nwa ya ugwu. O were ihe o bipụtara nʼugwu a metụ nʼụkwụ Mosis, kwuo sị, “Nʼezie, ị bụ di ọbara nʼebe m nọ.”

26Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.)

27Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ.

28Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile Onyenwe anyị ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.