10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị,
11“Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
12Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
13Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
14Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.