Ọpụpụ 6

Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.

Exodus 6:15 (UKJV) And the sons of Simeon; Jemuel, and Jamin, and Ohad, and Jachin, and Zohar, and Shaul the son of a Canaanitish woman: these are the families of Simeon.

13Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.

14Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.

15Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.

16Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha: Geshọn, Kohat na Merari. Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.

17Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha, bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.