Ọpụpụ 9

Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.

Exodus 9:32 (UKJV) But the wheat and the spelt were not smitten: for they were not grown up.

30Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.”

31Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru.

32Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.

33Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ.

34Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.