26Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ.
27Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu.
28Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube Onyenwe anyị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.