18Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ.
19Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Onyenwe anyị, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha.
20Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim.
21Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ na nku anọ, na ihe yiri aka mmadụ nʼokpuru nku ha.
22Ihu ha yikwara ihu ihe ndị ahụ m hụrụ nʼakụkụ osimiri Keba. Nke ọbụla na-agakwa ije nʼihu ihu na-eleghị anya nʼazụ.