Izikiel 11

Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel.

Ezekiel 11:1 (UKJV) Moreover the spirit lifted me up, and brought me unto the east gate of the LORD's house, which looks eastward: and behold at the door of the gate five and twenty men; among whom I saw Jaazaniah the son of Azur, and Pelatiah the son of Benaiah, princes of the people.

1Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel.

2Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.

3Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.