17“Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’
18“Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ.
19Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.
20Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
21Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”