5Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ.
6Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”
7Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.
8Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
9“Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’