10“ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
11Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.
12Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”
13“ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.
14Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.