17“Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha
18sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya?
19Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.
20“ ‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.
21Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.