Izikiel 13

Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.

Ezekiel 13:22 (UKJV) Because with lies all of you have made the heart of the righteous sad, whom I have not made sad; and strengthened the hands of the wicked, that he should not return from his wicked way, by promising him life:

20“ ‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.

21Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

22Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.

23Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.