21“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya.
22Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem.
23A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.