Izikiel 16

Eyinyere m gị ihe ịchọ mma, tinye ọlaaka nʼaka gị, nakwa ọlaolu nʼolu gị.

Ezekiel 16:11 (UKJV) I decked you also with ornaments, and I put bracelets upon your hands, and a chain on your neck.

9“ ‘Eji m mmiri saa gị ahụ, sachapụ ọbara dị gị nʼahụ, teekwa gị mmanụ.

10Enyere m gị akwa ọcha na uwe a kpara nke ọma, nke i ji kpuchie ahụ gị. Nyekwa gị akpụkpọụkwụ e ji ezi akpụkpọ kwaa, jirikwa ezi akwa ọcha na uwe ndị dị oke ọnụ kpuchie gị.

11Eyinyere m gị ihe ịchọ mma, tinye ọlaaka nʼaka gị, nakwa ọlaolu nʼolu gị.

12Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.

13E ji ihe ịchọ mma ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma. Uwe gị bụkwa uwe ezi akwa ọcha, uwe dị oke ọnụ, na uwe a kpara nke ọma. Nri ị na-eri bụ ụtụ ọka a yọchaziri nke ọma, na mmanụ aṅụ, na mmanụ oliv. Mma gị pụtaziri ihe nke ọma, ị ruo ogo ịbụ eze nwanyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.