Izikiel 16

Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.

Ezekiel 16:27 (UKJV) Behold, therefore I have stretched out my hand over you, and have diminished yours ordinary food, and delivered you unto the will of them that hate you, the daughters of the Philistines, which are ashamed of your lewd way.

25I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ, mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye.

26Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba.

27Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.

28Gị na ndị Asịrịa akwaala iko, nʼihi na afọ adịghị eju gị. Ọ bụladị mgbe nke a gasịrị, ị bụkwa onwe na-enweghị afọ ojuju.

29I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.