Izikiel 16

sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.

Ezekiel 16:3 (UKJV) And say, Thus says the Lord GOD unto Jerusalem; Your birth and your nativity is of the land of Canaan; your father was an Amorite, and your mother an Hittite.

1Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,

2“Nwa nke mmadụ, gwa Jerusalem okwu mee ka ọ mara banyere ndụ ya niile rụrụ arụ

3sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.

4Nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị, ebeghị otubo gị, ọ dịghị onye lekọtara gị maọbụ jiri mmiri saa gị ahụ ị sachapụ gị unyi maọbụ tee gị nnu, maọbụ jiri akwa kechie gị.

5Ọ dịghị onye nwere obi ebere nʼebe ị nọ. Ọ dịghị onye ihe banyere gị metụrụ nʼobi, ọ dịkwaghị onye lekọtara gị. Kama nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị a tufuru gị nʼọhịa, nʼihi na-eledara gị anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.