Izikiel 18

Ọ dịghị emegbu onye ọbụla, maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ. Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;

Ezekiel 18:16 (UKJV) Neither has oppressed any, has not withheld the pledge, neither has spoiled by violence, but has given his bread to the hungry, and has covered the naked with a garment,

14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.

15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel. Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.

16Ọ dịghị emegbu onye ọbụla, maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ. Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;

17ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla, na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego, na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile. Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ.

18Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.