Izikiel 20

Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha.

Ezekiel 20:14 (UKJV) But I wrought for my name's sake, that it should not be polluted before the heathen, in whose sight I brought them out.

12Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-edo ha nsọ.

13“ ‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara.

14Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha.

15Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma.

16Nʼihi na ha jụrụ iwu m, ha jụkwara ịgbaso ụkpụrụ m niile. Ha merụrụ ụbọchị izuike m, nʼihi na obi ha niile dị nʼebe arụsị ha dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.