Izikiel 20

Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Ezekiel 20:42 (UKJV) And all of you shall know that I am the LORD, when I shall bring you into the land of Israel, into the country for the which I lifted up mine hand to give it to your fathers.

40Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

41Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ.

42Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

43Nʼebe ahụ, unu ga-echeta obibi ndụ na omume mmehie niile unu ji merụọ onwe unu. Unu ga-asọkwa onwe unu oyi, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere.

44Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.