46“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda.
47Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile.
48Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’ ”
49Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ bụghị naanị ilu ka ọ na-atụ?’ ”