Izikiel 20

Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.

Ezekiel 20:6 (UKJV) In the day that I lifted up mine hand unto them, to bring them out of the land of Egypt into a land that I had espied for them, flowing with milk and honey, which is the glory of all lands:

4“Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere.

5Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”

6Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.

7Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”

8“ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.