7Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
8“ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt.
9Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha.
10Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara.
11Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ.