11Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ.
12E nwekwara ndị na-anara ego gbuo mmadụ ibe ha nʼime gị. Gị onwe gị na-anarakwa ndị i binyere ego ụma buru ibu, na-esitekwa nʼaka ike na-anara ndị mmadụ ihe ha. I chefuokwala m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
13“ ‘Lee, aghaghị m ịkụkọta ọbụ aka m abụọ nʼihi uru nke na-ezighị ezi ị na-eri, na ọbara niile nke ị wụsiri nʼetiti gị.
14Obi gị ọ ga-esikwa ike? Ị ga-eguzokwa nʼụbọchị m ga-ekpe gị ikpe? Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola. Aga m emezukwa ya.
15Aga m achụsa unu nʼetiti mba niile, fesaa unu nʼetiti mba niile. Aga m emekwa ka adịghị ọcha unu kwụsị.